Take a fresh look at your lifestyle.

Taa ka ụlọikpe mkpesa ga-ekpebi ikpe gbasara ihichapụ BVAS maka ntuliaka Maachị 11

0 823

Ụlọikpe mkpesa dị n’Abuja ga-anọ taa bụ Wenezde kpebie ma ha a ga-enye ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission’ (Inec) ikike ịga n’ihu hichapụ ihe niile dị n’igwe Bimodal Voter Accreditation System, iji were ya rụọ ọrụ n’ụbọchị Satọde abali iri na otu nke onwa Maachị.

Inec na-arịọ ka ụlọikpe nye ha ikike ime nke a ka ọ ghara igbochi ntuliaka nke ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu steeti dị icheiche na Naịjirịa.

N’ụbọchị Tuzde,abali asaanke onwa Maachị, ka okwu ahụ pụtara n’ihu ndị ọkaikpe nke ụlọikpe mkpesa, dịka otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party na Labour Party na-ekwu na Inec ekwesịghị ihichapụ BVAS ndị ahụ n’ihi na ọ bụ na ha ka ha ga-esi weta ihe akaebe ha ga-eji gosi na nrụrụaka dị na ntuliaka nke onyeisiala bụ nke e mere n’abali iri abụọ na ise nke ọnwa Febrụwarị.

N’ikpe ahụ, ọkaiwu Onyechi Ikpeazu (SAN) nọchitere anya otu LP na onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala bụ Peter Obi, ebe Emeka Etiaba (SAN) nọchitere anya Abubakar Atiku na otu PDP.

Mana Inec na-akọwa na ọ BVAS ndị ahụ ka ha kwesịrị iji mee ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị ụlọ omeiwu steeti dị icheiche n’ụbọchị Satọde na-abịanụ bụ abali iri na otunke onwa Maachị.

Tanimu Inuwa, bụ ọkaiwu Inec, gwara ụlọikpe ahụ sị: “Ọgbọ ntuliaka ọbụla nwere BVAS nke ya. BVAS Inec nwere dị 176,000. Anyị kwesịrị ihichapụ BVAS ndị a ma kwadebe ha maka ntuliaka ọzọ.”

“Anyị ekwela nkwa na onweghị ihe ọbụla dị na BVAS ugbua nke ga-efu efu n’ihi na anyị echekwaala ha na ‘backend server’ anyị.”

“Ọ bụrụ na e nye otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ a ohere inyocha BVAS ndị a ugbua, ọ ga-abụ ihe ndọghachi azụ na nkwado anyị na-eme maka ntuliaka nke na-abịanụ.”

Ndị ọkaikpe ụlọikpe mkpesa kwuru na ha ga-enye mkpebi ha n’okwu a taa bụ Wenezde,abali asatọ nke ọnwa Maachị afọ 2023.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *