Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ise a na-atụ anya n’aka Onyeisiala ga-abata

0 387

Nani ma ụlọikpe akagburu mpụtara ntuliaka e mere n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, Bola Ahmed Tinubu nke pati ‘All Progressives Congress’ ga-abanye n’oche dịka Onyeisiala Naijiria n’obi Gọọmentị Etiti bụ ‘Aso Rock’ dị n’Abuja, n’abalị iri abụọ na itolu nke ọnwa Mee, afọ a.

Mana ya bụ ije abụghị ụtaba achị n’aka agba egwu n’ihi n’ọrụ chere onyeisiala ọhụrụ n’oge a Naijiria nọ na nnukwu nsogbu ga-abụ dịmkpa n’okwu ma n’omume.

Lee ọrụ ụfọdụ ndị ọkachamara n’okwu ndọrọndọọ kwuru a na-atụ anya n’aka ga-eche onye ga-abanye n’ọrụ onyeisiala aka mgba:

  1. Ikpe udo

Jọstis Chukwudifu Oputa bụ onye nọ n’isi otu pụrụ iche e hiwere a kpọrọ ‘Oputa Panel” maka ịleba anya na mkpagbu na mmegide e megidere ndị mmadụ malite n’afọ 1984 rue afọ 1999

Obi adịghị ndị mmadụ mma dịka ntuliaka si gaa.

Ndị zọrọ ọkwa ahụ mana o ruteghị ha aka, na ndị na-akwado ha, anaghị achị ọchị.

Ọ bụ ọrụ dịịrị onyeisiala na-abata ‘ịchịtọkọta onye ọbụla ,., dịka Obodo nOtụ Onye ma ihe ekwe na-ak ụ n’okwu ndọrọndọrọ Ọchịchị bụ Dennis Ekemezie siri kwuo.

Ọ sịrị ” Ọ ga-ebidogodi n’ihe a kpọrọ ‘National Reconciliation nke Bishop Desmond Tutu nke South Africa na “Oputa Panel’,iji leta ọnya nke nkewa dị na Naijiria iji kpalite ụmụ NAijiria iji hụ na Naijiria bụ nke anyị.”

Okenye ahụ bụ onye ji ọgbakọ udo National “Ka e nwe ọgbakọ ụmụ Naijiria maọbụ bọlite akwụkwọ ọgbakọ ọha Naijiria nke e mere n’oge nke Goodluck Jonathan maọbụ nke Jọstis Oputa mere.”

  1. Ikwalite Akụnaụba

E jighị ịgba agwa ya onyeọcha na obodo bụ igwe ugbua na Naijiria.

Ego adịghị, ọrụ adịghị, agụ na ụbịa na-asụ ọtụtụ ndị mmadụ akwụ.

Ekemezie sị,”Ndị Naijiria enwezịghịzi ntukwasi obi n’ego Naijiria.

” Ka a mara ihe a ga-eme ka ego Naijiria nwee ugwu soro chịwa n’ego ndị ọzọ nọ n’ụwa.”

  1. Atumatu nchekwa obodo

N’Ugwu Awụsa, ndị Boko Haram na-aka ike, n’Ọwụwa Anyanwụ a na-arịa nsogbu ndị na-eti mkpu nnwereonwe, Nna Ndịda Ndịda, ndị na-ezu ohi mmanụ agbịdị na-eme nke a. Ntọ na mpụ dị ọzọ na-arịkwa ibe ya elu.

A na-atụ anya na onyeisiala ga-elebanye nke anya iji belta ya.

dịka Ekemezie si kọwaa, “E toro m n’Ugwu Awụsa, ọ bụ ihe na-eme n’Ugwu Azụsa mere m ji gbalata n’ihi na enweghịzị nchekwa zuru Naijiria ọnụ.”

Malite n’afọ 2009 rue Julaị afọ 2015, mkpamkpa ha ebutela ọnwụ mmadụ ruru 20,000, ebe mmadụ dị otu nde 1.3 bụ ndị gbapụrụla ọsọ ndụ, dika ozi ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye n’otu United Nations isir kwuo, n’oakwụkwọ ha wepụtara n’afọ 2015.

  1. Nkwalite njirimara Naijiria

Ịkpalite mmụọ ịbụ onye Naijiria n’ụmụamala Naijiria bụ ihe a na-ele anya onyeisiala ọhụrụ ga-elebanye anya.

Ụmu Naijiria bụ ndị e ji ịgbasi mbọ ike, nkwuwaokwu nakwa mmụta mara.

Mana n’afọ ole na ole gara aga, e ji ime mpụ, ịgba mgbere ọgwụ ike na nrụụaka mara NAijiria nke mere ka ọtụtụ jiri anya e ji ele onye ekpenta ele akwụkwọ njirimara nwaala nke Naijiria(Nigerian Passport) na mba ndị ọzọ.

Ekemezie kwuru mkpa ọ dị ịkpọlitekwa mmụọ Naijiria n’ime ụmụ Naijiria.

“Onye Naijiria na-aga ebe ọbụla n’ụwa, ị hụ ya ị mara na ọ bụ onye Naijiria.”

“O nwee ọkịkaobi na ọ bụ onye Naijiria, na-emekwa ka onye Naijiria.”

Njirimara onye Naijiria dịka o si kwuo bụ: “Onye Naijiria na-agbasi mbọ ike, hụ ala Naijiria n’anya, hụkwa ụmụnne ya n’anya.”

  1. Nhazighari ngalaba ikpe na Naijiria

A na-ahụta ngalaba ikpe dịka olile anya ọha ndị mmadụ maka inweta ikpe nkwụmatọ mana nsonso a, ụfọdụ ụmụ Naijiria na-enwe obi abụọ ịga ụlọikpe maka okwu dịịrị ha na ndị ọzọ.

Na nsonso a, ụfọdụ ụmụ Naijiria gụnyere onye so Peter Obi nke Labour Party zọọ ọkwa Onyeisiala Naijiria dịka Osote ya bụ Yusuf Datti kwuru na ọ kachaghị ya obi ị ga ụlọikpe ụlọikpe n’ọsịsa oku ụfọdụ ndị na-akpọ ka ndị mpụtara ntuliaka 2023 adịghị obi mma gaa ụlọikpe.

Ekemezie sịrị, “Ọ ga-adị mkpa na e mere ka ngalaba ikpe kwụrụ ekeresu ka ọ ga-abụ ekpe ikpe ike ọ bụrụ ikpenkwụmọtọ ka ndị mmadụ were nwee ntụkwasa obi na ngalaba ikpe.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *