Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi adaala ntuliaka ịnọchite anya mpaghara Enugwu North n’ụlọ omeiwu ukwu nke Naịjirịa.
Onye meriri ya bụ ntuliaka bụ Mazi Okechukwu Eze a nke nọ na ‘Labour Party’.
Onye isi ụlọọrụ Inec haziri ntuliaka na mpaghara ahụ bụ Chukwuemeka Ubaka kpọpụtara mpụtara ntuliaka ahụ n’isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Nsukka n’ebe elekere ise na ọkara nke ụtụtụ taa bụ Mọnde.
Dịka Ubaka si kpọpụta, Eze a nwetara vootu 104,492 iji merie Ugwuanyi onye nwetara naanị vootu 46,948.
Onye pati Apga gbara onye nke atọ dịka o nwetara vootu 6,816
Leave a Reply