Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Nta Akụkọ Agbaala Ndị Naijiria Ume Ịdịkọ N’Udo.

Tunde Akanbi dere ya na Bekee

0 365

Ka ntuliaka Onyeisiala nke Satọde na-erute nso, National League of Veteran Journalists (NALVEJ) na Kwara State, akpọkuola ndị Naijiria ka ha na-akpakọrịta onwe ha n’usoro udo.

Otu ahụ kpọkuru ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị na-akwado ha ka ha gbanarị omume ọ bụla nwere ike ịkpaghasị mmemme ahụ, na-echetara ha na anya niile dị na Naịjirịa ugbu a.

NALVEJ na nkwupụta nke onye isi oche ya, Alhaji Tunde Akanbi na onye ode akwụkwọ mgbasa ozi, Alhaji Abdullahi Olesin binyere aka, kpọkuru ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọchịchị, Independent National Electoral Commission (INEC) ka ọ nọgide na-abụ ezi onye nledo anya nye ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị niile na ndị na-akwado ha.

O nyekwara ndị ụlọ ọrụ nchekwa iwu agbam ume ka ha weta nchekwa zuru oke na mba ahụ, tupu, n’oge, na mgbe emechara ntuliaka ahụ.

“NALVEJ, otu ndị nta akụkọ na-eji ọgbakọ a na-arịọ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị na ndị na-akwado ha ka ha gbasie mbọ ike inweta ntuliaka n’usoro udo na Satọde abalị iri abụọ na ise ọnwa Febụwarị, 2023,” ka o kwuru na nkwupụta ahụ.

Otu ahụ kpọkukwara ndị nne na nna na ndị nlekọta ka ha dọọ ụmụ ha aka na ntị ka ha ghara ime ihe ike n’oge ntuliaka ahụ.

“Anyị na-arịọ ka ntuliaka ghara ịbụ ihe tigbuo zọgbuo n’ihi na ọ bụ naanị Chineke na-enye onye ọ chọrọ ike. Anyị na-arịọ ndị otu dị iche iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ha rube isi na nkwekọrịta udo nke ha niile binyere aka.

“Anyị na-arịọkwa INEC ka ha hụ na e mere ntuliaka n’udo, nke doro anya na nke ziri ezi n’ihi na anya ụwa niile na-ele ha.

“NALVEJ nwere obi ụtọ maka nkwa nke Onyeisiala Muhammadu Buhari kwere maka inye ndị mmadụ nchekwa n’oge ntuli aka. Ya mere, anyị na-agba ndị isi ọrụ nchekwa ume ka ha mezuo ntuziaka ahụ onyeisiala nyere nke ọma.“ Nkwupụta ahụ gbakwụnyere.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *