Take a fresh look at your lifestyle.

Oke mmiri ozuzo egbuola ọtụtụ mmadụ na mba Brazil

0 430

Ndị ọchịchị Steeti São Paulo nke mba Brazil ekwupụtala na mmadụ iri ato na isii lara mmụọ n’ụbọchị Sọnde n’ihi oke mmiri ozuzo nke butere ideimmiri nakwa mbuze na mpaghara ahụ.

Ihe onyonyo gosiri etu ideimmiri si jupụta n’okirikiri ebe ndị mmadụ bi, nakwa n’okporoụzọ, dịka ya bụ mmiri kwatukwara ọtụtụ ụlọ.

Mmiri zoro naanị n’ụbọchị Sọnde na mpaghara São Paulo ji ugboro abụọ karịa mmiri na-ezo n’ime ọnwa abụọ na mpaghara ahụ n’oge mbụ.

“Ndị ọrụ gbatagbata enwebeghị ike ịgaru na mpaghara ụfọdụ ebe ideimmiri a kacha njọ,” Felipe Augusto, bụ Mayor nke obodo São Sebastião kwuru.

“Anyị amatachabeghị kpọmkwem ihe niile mebiri n’ọdachi a. Anyị ka na-agba mbọ ịọpụta ndị mmadụ.”

“Ọtụtụ mmadụ ka anyị ka na-achọ achọ, ihe karịrị ụlọ iri ise adaala mmiri eburu ha,”Augusto kwuru.

Ndị ọchịchị obodo na-ekwu na ihe karịrị mmadụ nari abuo iri abuo na asato enweghizi ebe obibi n’ihi ihe mberede a, mmadụ nari ato iri ato na asato ọzọ bụ ndị a zọpụtarala na mpaghara Ugwu nke São Paulo.

Etinyela ọnọdụ ike nkwụcha maka ihe mberede na mpaghara isii na steeti São Paulo. Ha gụnyere: São Sebastião, Caraguatatuba, Ilhabela, Ubatuba, Guarujá na Bertioga.

Gọvanọ steeti ahụ bụ Tarcísio de Freitas kwuru na ya ewepụtala ego ruru otu nde dọla na ọkara iji kwado ọrụ ndị gbatagbata ma nyekwara ndị ya bụ ọdachi metụtara aka.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *