Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị omeiwu mba Kenya so onye otu ha pụọ maka ọbara nsọ nwaanyị metọrọ uwe ya

0 310

Gloria Orwoba bụ onye omeiwu mba Kenya ndị omeiwu ibe ya sị ya pụọ n’ihi na ihe dịka ọbara nsọ nwaanyị ya metọrọ uwe ya gwara ndi ntaakụkọ na obi dị ya ụtọ n’ihi na ọ na-alụ ọgụ megide “Ihere so nsọ nwaanyị”.

Orwoba kwuru na ọ hụrụ ya bụ mmetọ tupu ọ bata n’ime ụlọ ndị omeiwu.

” N’uche nke m, dịka m ba-alụ ọgụ megide nkatọ sitere na nsọ nwaanyị, echere m na m ga-eme dịka m sị ekwu”.

Kama ndị omeiwu ndị ọzọ nke gụnyere ụmụnwaanyị na-ekwu na ihe ọ mere bụ ihe mkparị.

Onye omeiwu bụ Tabitha Mutinda kwuru sị, ” Anyị amaghị ma ọ bụ ezigbo ọbara nsọ ka ọ bụ nke adịgboroja, ya bụ ihe adịghị mma maọlị”.

Mutinda kwuru na enwere ụzọ ọzọ ọ nwereike iji kwuo ihe ọ chọrọ ịkwụ ma sị na ọ bụghị ezigbo ihe ntụziaka nya ụmunwanyị ndị na-eto eto.

Ebe Orwoba na-ekwu na ihe ha kwuru ejughị ya afọ ma sị, “Ọ bụ ihe mberede nke sọ ahụ mmadụ…nsọ nwaanyị ịmetọ uwe”.

O kwukwara na ya yi uwe ziri ezi dịka iwu ndị omeiwu siri kwado.

” E nwere otu nwata nwanyị gburu onwe ya maka otu ihe a, ugbua ka m ghọtara n’ihi na ọ bụị ụmụ nwaanyị na-achọ ime ya ka ọ dị ka ọ bụ arụ”.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *