Ala ọmajijiji nke ukwu dakwasiri ọwụwa anyanwụ mba Turkey n’ụzụ ụtụtụ ụbọchi Monde ma gbuo ihe karịrị mmadụ narị ise ebe ndị ọzọ ọzọ ka tọrọ atọ n’okpuru ụlọ ndị dara ada.
Ngalaba mba US na-enyocha ụdịrị ihe a mere kwuru na ala ọmajijiji ahụ mere ihe dịka ebe elekere anọ nke ụzụ ụtụtụ (bụ elekere abụọ na Naịjirịa) na mba ahụ.
Dịka ebe ọmajijiji ahụ metụtara dị nso n’oke ala Turkey na mba Syria, mmadụ nari abụọ na iri atọ nwụrụ site na ya na Syria ebe mba Lebanon na Cyprus nụkwara ya bụ ala ọmajijiji be ha.
Osote onyeisiala mba Turkey bụ Fuat Oktay na-ekwu na ọnụọgụgụ ndi nwụrụ na Turkey esila na iri asaa na isii rigoo nari abụọ iri asatọ na anọ nke mere na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ agafeela nari ise.
Mpaghara ebe ndị ọnwụ a metụtara n’ime mba Turkey gụnyere Aleppo, Latakia, Hama nakawa Tartus.
Dịka akụkọ ka na-amalite, ọ pụtala ihe na anụrụ ụda ya bụ alaọmajijiji na Gaza dị nso na mba Izrel nakwa Palestine.
A na-atụ egwu na ọnụogụgụ ndị nwụrụ ka ga na-agbali elu dịka a na-achọpụta ma na-azọpụta ndị mmadụ n’okpuru ụlọ ndị dara.
Leave a Reply