Kọmitii izugbe (National Working Committee) nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị People’s Democratic Party, (PDP), ewepụtala kọmitii nke mmadụ anọ mejupụtara nke ga-achịkwa paati ahụ na steeti Ekiti, n’ime Naijiria.
Osote onye isi oche PDP, Taofeek Arapaja, mebere kọmitii ahụ n’Abuja, isi obodo Naijiria.
Ọ kpọkuru kọmitii ahụ ka o dozie esemokwu dị n’etiti ndị otu paati ahụ e mejọrọ iji mee ka paati ahụ nweta ohere mmeri na ntuliaka na steeti ahụ.
“Anyị na-enye ụnụ ohere ugbu a. Ọrụ dịịrị ụnụ ịhụ na ụnụ weere ohere a iji wetaghachi paati a ma wugharịa ya iji nweta mmeri a chọrọ. Kọmitii a kwesịrị inye pati a nsonye ọhụrụ maka ndị otu ya niile’’. Arapaja kwuru
.
Onye isi oche Kọmitii ahụ na steeti Ekiti, Maazị Sadiq Obanoyen ka ọ na-ekwu okwu nnabata, kwere nkwa na ya ga-enwetara PDP mmeri na ntuliaka izugbe na-abịa. “Anyị kwenyere site n’amara Chineke, nakwa site na nkwado gị, anyị nwere ihe niile ọ ga-ewe iji mee udo ma jikọta ndị otu anyị tupu ntuli aka na-abịa.”
Steeti Ekiti, bụ otu n’ime steeti ndị Independent National Electoral Commission (INEC), na-eme ntuliaka adanyeghị n’oge na mba ahụ.
Ike Umenaba
Leave a Reply