Abuja-Kaduna Train Service maliteghachiri ọrụ.
Ụlọ ọrụ ụgbọ oloko nke Naijiria ekwupụtala ịmaliteghachi ọrụ ụgbọ oloko Abuja Kaduna nke kwụsịrị na Fraịde 27th Jenụwarị 2023 n’ihi nhụsianya ahụ mere n’ọdụ ya na Kubwa.
Ụlọ ọrụ Railway kwụsịrị ọrụ ụgbọ oloko Abuja-Kaduna
Nkwupụta a sitere n’aka onye isi, Operations Mr Niyi Alli kwuru na ọrụ ahụ ga-amaliteghachi na Tuzdee 31st Jenụwarị 2023 yana usoro ụbọchị na-esote;
* KA2 na-apụ Rigasa na 0700
* Ak1 na-apụ Idu n’elekere 10.00
- KA4 na-apụ RIGASA na elekere 13.00
* AK3 na-apụ idu na .16.00.
Agbanyeghị na Wednesde naanị KA2 ga-apụ Rigasa na Kaduna State, na 0700 na AK 4 ga-apụ Idu na Abuja, na elekere 16.00.
Mazị Alli n’aha ụlọ ọrụ ahụ rịọkwara ndị ahịa ya mgbaghara ọzọ na-ekwu na ụlọ ọrụ ahụ na-akwa ụta maka nsogbu ndị njem ọ bụla nwere ike ịnwe n’ihi nkwụsịtụ nwa oge nke ọrụ ahụ.
Leave a Reply