Take a fresh look at your lifestyle.

Ọmụ.

CHIGO DERE YA.

0 683

Ihe e ji ọmụ eme

Ebe ọbụla e kere ọmụ maọbụ tinye n’ala na-egosi na a na-azọ ala ahụ azọ.

  • E ji ọmụ ekechi ihe dị iche iche dịka ụgba, ogiri, nakwa akwụkwọ nri.
  • Ihe e ji ọmụ kechie n’ala Igbo, anaghị ezu ya ezu; dịka onye kpara nkụ n’ọhịa ga-etinye ọmụ na nkụ ya iji gosi na ọ bụ mmadụ nwe ya.
  • E jikwa ọmụ egosi ihu arụsị ma na-asị kwa ndị mmadụ abatala ebe ahụ.
  • E jikwa ọmụ egosi ebe mmanwụ na-esi apụta.

 

Ọmụ na-egosi ebe mmụọ si apụta

. Ọmụ e kere n’ukwu osisi na-egosiputa na osisi ahụ dị nsọ n’omenala Igbo.

. E kee ọmụ n’ụgbọala, ọ na-egosị na ụgbọala ahụ bu ozu.

. Onye mmadụ bịara nye ọmụ n’aka, dịka ịsị onye ahụ na ya “kpachara anya” n’ebe onye ahụ nọ; ya bụ ịdọ aka na ntị.

. Ndị otu Ọkọnkọ na-eji ọmụ ekewapụta onwe ha na ndị ọzọ na-abụghị ndị otu ha.

 

Ọmụ n’egosị ihe dị nsọ n’ala Igbo.

. N’ebe dị ka Ibeku, Ụmụahịa, n’ala Igbo, igbubi ọmụ na-egosi na e mechaala mmemme ahụ dịka ekpe.

. N’Ọhafịa, ndị na-agba egwu ikpirikpi ọgụ na-akpụrụ ọmụ n’ọnụ.

Ha agaghị ewepụ ya tupu agbachaa egwu a.

. N’agba ọhụrụ a, ndị ụka ji ọmụ eme ụkaọmụ bụ ‘Palm Sunday’ na Bekee.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *