Take a fresh look at your lifestyle.

“Steeti Anambra  dekọbara ọrịa ahụ ọkụ Lassa iri na ise a na-enyo enyo.

MERCY CHUKWUDIEBEREDERE YA NA BEKEE.

0 401

“Steeti Anambra  dekọbara ọrịa ahụ ọkụ Lassa iri na ise a na-enyo enyo.

Gọọmenti Anambra steeti akwadola mmadụ iri na ise a na-enyo enyo na ha bu ọrịa  ahu ọkụ Lassa na out onye nke nwụrụ ọnwụ na Tọzdee n’Awka, isi obodo steeti ahụ.

“N’Anambra, anyị edeela mmadụ iri na ise a na-enyo enyo na ha bụ ọrịa ọkụ Lassa na otu ọnwụ kemgbe afọ ahụ,” Kọmishọna na-ahụ maka ahụike, Dr. Afam Obidike kwuputara.

Otu n’ ahụ maka ihe mberede.

Obidike kwuru na ndị otu na-ahụ maka ihe mberede steeti ahụ na-azaghachi na ụzọ ịkwụsị maka  ndị a na-enyo enyo buu ya ma tinyekwa usoro nleba anya dị mkpa iji belata mgbasawanye  ọrịa ahụ.

O kwuru na “gọọmentị ewepụtala ndị otu na-achọ kọntaktị iji nyochaa  ndị achọpụtara.”

ỤZỌ E KWURU IJI GBOCHIE ỌRļA AHỤ.

Ọ sịrị; “Kpachie oghere niile dị n’ụlọ gị ka oke ghara ịbanye. Kpuchie ihe mkpofu gị ma kpofuo ihe mkpofu nke ọma.

“Mụọ ịdị ọcha nkeonwe na aka site n’iji ncha na-asa aka ugboro ugboro n’okpuru mmiri pọmpụ.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *