Ndị otu a kpọrọ Anambra Civil Society Network (ACSONET) ekeleela aka na-achị steeti Anambra bụ Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo na nhọpụta ya dị ka onye ndu otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ All Progressive Grand Alliance (APGA).
Onye ndu otu ahụ, Prince Chris Azor kwuru na ọkwa ọhụrụ ahụ bụ nzọụkwụ n’ụzọ ziri ezi ma bụrụkwa mkpalite obi iji nweta nnukwu ọganihu.
“Nke a bụ ọkwa dị elu kwesịrị ekwesị yana ngosipụta ntụkwasị obi paati ya nwere na agwa idu ndu ya. Ya mere, ọ na-achọ ka e tinyekwuo mgbalị, dị ka a na-ekwu, ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike bụ ịrụ ọrụ karịa,” O kwuru.
Comrade Azor kpọkukwara Gọvanọ ka o were ohere dị n’ọkwa ọhụrụ ya gbasie mbọ ike iji nweta ebumnobi ezi ọchịchị na iwulite obodo.
Akụkọ nhọpụta Gọvanọ Soludo sitere n’akwụkwọ ozi onye ode akwụkwọ mgbasa ozi ya, Christian Aburime wepụtara nke kwuru na ndị otu ahụ ji otu olu were họpụta gọvanọ dịka onye isi otu paati ahụ, n’oge ọgbakọ NEC nke pati ahụ nwere na International Convention Center dị n’Awka.
“Onye isi oche paati ahụ bụ Ozonkpu Victor Oye nyere Gọvanọ Soludo akwụkwọ asambodo ahụ n’ihu ndị otu NEC niile,” O kwuru.
Gọvanọ Soludo, mgbe ọ natara asambodo ahụ, kwuru na ọ bụ ihe obi ụtọ, jiri obi umeala na ekele Chineke, iji obi umeala nabata nsọpụrụ nke ịbụ onye ndu nke APGA.
“Nke a ewedarala m ala! Enwere m mmetụta dị arọ nke akụkọ ihe mere eme ugbu a. APGA bụ njikọ nke ndị niile na-aga n’ihu.”
O kwukwara na ya nwere mmetụta dị arọ nke ndị tufuru ndụ ha iji hụ na paati ahụ dị ndụ.
Ike Umenaba
Leave a Reply