Kọmitii Executive nke Nigeria Football Federation (NFF) enyochala ala ego ndebanye aha ndị otu ga-akwụ ụgwọ iji sonye n’asọmpi iko Federation nke afọ a. Ebe ndị otu nwoke ga-ewepụta ego ruru puku naira iri asaa ka ha so n’asọmpi nke afọ a, ndị otu nwanyị ga-akwụ naanị puku naira iri ise. Onye na-ahụ maka asọmpi NFF bụ Ruth David kwuputara na NFF Board ahọrọla ileba anya n’ụgwọ ala ala iji gbaa ọtụtụ klọb ume isonye na asọmpi nke afọ a, ma n’ụdị nwoke na nwanyị. Ọ bụ ezie na ụgwọ ndebanye aha na-agbada, mmemme ahụ n’onwe ya agbanweghị site na ihe a gwara ndị otu egwuregwu bọọlụ na steeti 36 na FCT Ndebanye aha klọb ga-adịgide n’ime abalị iri na isii ruo 30th Jenụwarị. Ọ bụ ezie na ntinye akwụkwọ nke ndị egwuregwu dechara maka mmepụta nke ikikere ga-eme site n’abali iri ato na out nke onwa Jenụwarị ruo abali isii nke onwa nke February,afo 2023. Asọmpi iko Federation nke afọ a na steeti dị iche iche na FCT ga-eme n’etiti February 18th – Maachị 19th, ebe steeti na FCT na-atụ anya inyefe aha ndị nnọchi anya ha abụọ na asọmpi mba n’aka NFF ka ọ na-erule Maachị 20th. A ga-ekpebi ụbọchị maka asọmpi egwuregwu, National Draws na ọkwa dị iche iche nke asọmpi mba n’oge na-adịghị anya.
Leave a Reply