Take a fresh look at your lifestyle.

Afọ ole ka nwata kwesịrị iru tupu e nyewe ya ọgwụ ụkwara?

0 513

Akụkọ dị icheiche apụtala n’ọdị nso a na mba ụwa dị icheiche gbasara etu ahụike ụmụaka si kawanye njọ dịka ha ṅụchara ọgwụ ụkwara.

N’ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba ka otu nwata dị afọ abụọ na ọkara kwụsịrị iku ume n’obodo Mumbai na mba India dịka e nyere ya ọkwụ ụkwara.

Tilottama Mangeshkar bụ nne ochie nwata ahụ, bụrụkwa dọkịnta, gwara BBC na ọ bụ nne nwata ahụ nyere ya ọgwụ dịka ọ na-akwa ụkwara, o teghizi aka, nwata ahụ adaa jụụ, kwụsị ịmegharị ahụ.

“Oge nne ya bịara kpọọ mụ n’imeụlọ, m gbara pụta hụ na ụcha nwata ahụ agbanweela, ọ naghị eku ume, m wee malite inye ya CPR, tupu anyị were ọsọ gbaga ụlọọgwụ,” Dọkịta Mangeshkar kwuru.

“Dịka nkeji iri na asa gachara, nwata ahụ nwetakwara onwe ya, malite iku ume.”

“Anyị mere nnyoch wee chọpụta na ọgwụ ụkwara ahụ e nyere ya nwere akụrụngwa a na-akpọ Chlorpheniramine na Dextromethorphan.

“Na mba Amerịka, akụrụngwa a bụ ihe a machiri amachi itinye ya n’ọgwụ ụmụntakịrị na-erubeghị afọ anọ ga-aṅụ.”

Dọkịta Mangeshkar kwuru na ndị mepụtara ọgwụ ahụ edeghị n’ahụ ya na ụmụ ntakịrị na-erubeghị afọ anọ ekwesịghị ịṅụ ya bụ ọgwụ.

Ụkwara ụmụaka abụghị ihe ọjọọ – Ndị dọkịta

Dọkịta Mukesh Aggarwal bụ ọkachamara n’ahụike ụmụaka n’ụlọọgwụ KEM na Mumbai, gwara ndi ntaakuo na tupu nwata eruo afọ ise, akụrụngwa na-ebuso nje agha n’ahụ mmadụ a na-akpọ ‘immunity’, esichabeghị ike n’ahụ nwata ahụ.

Ya mere ọ bụghị ihe ịgba gharịị na nwata ahụ na-ebute nje nwereike ị na-akpatara ya ụkwara.

“Mana ọtụtụ n’ime ha, ya bụ ụkwara anaghị anọkarị abalị atọ maọbụ anọ, o were aka ya laara onwe ya,” Dọkịta Aggarwal kwuru.

“Ọ bụrụ na nje a nọtee aka karịa, e nwereike inye nwata ahụ ọgwụ antibiotics, mana ewepụ nke a, ụdị nje ndị ahụ na-alara onwe ha, ọ dịghị mkpa inye nwata ọgwụ ụkwara.”

Ndị dọkịta na-ekwu na ụkwara dị mma maka ụmụaka, maka na ọ na-enyere ha aka iwepụ ihe ndị na-adịghị mma n’ime ahụ ha.

Ụkwara ụmụaka kwesịrị iji aka ya kwụsị n’ụbọchị olemole, mana ọ bụrụ na ọ kwụsịghị, nne na nna nwata kwesịrị ịga hụ dọkịnta.

Nnyocha nke ngalaba ahụike mba India mere gosiri na nwatakịrị nwereike ịkwa ụkwara ihe karịrị ugboro iri na otu n’ụbọchị.

Ọnụọgụgụ a nwereike ịgbali elu n’oge nnukwu oyi na-atụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *