Take a fresh look at your lifestyle.

PDP Amalitela Achumnta Vootu Atiku-Okowa na steeti Anambra

Toochukwu Ifejika dere ya na Bekee

0 407

Na mkparịtaụka mgbasa ozi n’Awka, ụbọchị Wenezde, abalị nke iri na anọ ọnwa Disemba, onye nhazi otu kansụl achumnta vootu Atiku/Okowa na steeti Anambra, bụ Chiifu Obiora Okonkwo, kwupụtara usoro njem Atiku oge ọ ga-anọ n’isi obodo steeti ahụ.

“Na irute Awka n’elekere iri nke ụtụtụ Tọzdee, onye na-azọ onyeisiala na ndị otu ya ga-ezute Gọvanọ Chukwuma Soludo n’obi gọọmenti dị n’Awka. Ngwa ngwa ka ya na Gọvanọ mechara, Atiku, ndị otu ya na ndị eze ọdịnala ga-enwe mkparịta ụka”, O kwuru.

Chiifu Okonkwo kwuru na onye ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa onyeisiala ga-aga n’ihu gbaghee ụlọ achumnta vootu dị na Kwata Junction n’Awka. Site n’ebe ahụ ọ gaba na Senator Uche Ekwunife Event Center maka ịhụ ndị nhazi nke paati ahụ. Ọ gbakwụnyere na a ga-eji mmemme mmalite achumnta vootu onyeisiala n’Alex Ekwueme Square weta njem ahụ na njedebe .

Ndị Kọmitii achumnta vootu Atiku/Okowa na ndị otu paati ndị ọzọ n’ime steeti ahụ; Chiifu Dan Ulasi, Sinetọ Uche Ekwunife, na ndị ọzọ kwupụtara ihe ndị mere PDP ga-eji nweta mmeri n’Anambra steeti.

Ndị otu Peoples Democratic Party (PDP) dị njikere ịmalite achumnta vootu Atiku-Okowa na steeti Anambra maka ntuliaka izugbe afọ 2023.

“Mmalite achumnta vootu onyeisiala n’Awka n’ụbọchị Tọzdee ga-egosi na steeti Anambra abụrụla steeti PDP, ma na-agakwa n’ihu ime otu a,” Ka o kwuru.

Dịka onye nhazi achumnta vootu siri kwuo, “PDP bụ steeti Anambra, Anambra bụkwa PDP. Otu paati a na-enweta mmeri na steeti Anambra na ntuliaka onyeisiala ọ bụla. Ekwenyerem na nke afọ 2023 agaghị adị iche. “PDP na-akwado ndịda ọwụwa anyanwụ karịa mpaghara ndị ọzọ. Nke a bụ n’ihi na pasentị iri itoolu na ise nke ndịda ọwụwa anyanwụ nọ n’ọgbakọ omebe iwu mba ahụ nọ n’otu paati PDP, ọ dịkwa otu a kemgbe afọ 1999.” Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga-abụ ihe ize ndụ maka ndịda ọwụwa anyanwụ ilepụ anya na PDP na ntuli aka izugbe 2023 n’ihi ihe ọ bụla,” o kwughachiri.

O jikwa ohere ahụ mee ka o doo anya na otu paati ahụ ewepụtala otu ga-ahụ maka ma dozie ọgbaghara na-aga n’ihu metụtara otu gọvanọ G-5 na otu paati ahụ, ma kwupụta nchekwube ya na a ga-ebinyụ ọgbaghara ahụ ngwa ngwa.

Ike Umenaba

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *