Take a fresh look at your lifestyle.

Etu anyị siri rụpụta rọbọtụ nwere ọgụgụisi ka mmadụ – Chuks Ekwueme

0 797

Humanoid Robot: Etu anyị siri rụpụta rọbọtụ nwere ọgụgụisi ka mmadụ – Chuks Ekwueme

Omeife bụ rọbọtụ a rụrụ nwere ọgụgụ isi etu mmadụ sịrị nwee nke a na-akpọ Humanoid n’asụsụ bekee.

Ọ na-asụ asụsụ dị iche iche nke gụnyere English, Swahili, Arabic, Igbo, Yoruba, Hausa, French na ndị ọzọ.

O nwekwara ike ikpasa mmadụ nkata ma rụọ ụfọdụ ọrụ dị iche iche nke gunyekwara itughari asụsụ.

Ndi ntaakuo na Chukwudi Obinna Ekwueme bụ onyeisi ụlọọrụ ndị rụrụ Omeife nwere mkparịtụka ebe ọ kọwara na ọ bụ naanị ụmụ afọ Naijiria tikọrọ aka rụọ ya bụ rọbọtụ.

Ọ kwuru sị, “Ọ bụ naanị ndị Naịjirịa tikọrọ aka rụọ Omeife, enweghị onye mba ọzọ aka ya dị na ya”.

O kwukwara na Omeife bụ rọbọtụ mbụ dịka ya nke a rụrụ n’Afrika.

Ekwueme kwụrụ ihe uche obi ha bụ ma uru Omeife nwere ike ị baara ndị Naịjirịa na Afrịka niile gburugburu.

Kirie n’uju etu ụmụ Naijiria sịrị rụpụta agbara nwaanyị ‘humanoid’ a ndị Afrịka niile na-eji anya isi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *