Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Ọrụ Nchekwa Anwụchiela Ụgbọ Ala Bu Okporo Ụgbọ Oloko Ezuru Ezu.

Abdul Isa dere ya na Bekee

0 317

Otu ọrụ nchekwa Nigerian Security and Civil Defence Corps na Niger Steeti North Central Naijiria ejidela gwongworo abụọ bu okporo igwe ụgbọ oloko nke ọnụ ahịa ya ruru ọtụtụ nde naira na mpaghara Paiko na Garatu nke steeti ahụ.

Dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ nchekwa ahụ, Nasir Abdullahi, si kwuo, ejidere onye ọkwọ ụgbọ ala ahụ ya na gwongworo nke Dangote Group of Companies.

“Onye ọkwọ ụgbọ ala ahụ na nkwupụta ya, kwuru na ekwere ya nkwa ihe karịrị otu nde naira mana e nyere ya otu puku naịra dịka ugwo mbụ” DSC Abdullahi kwuru.

Onye isi izugbe ndị ọrụ nchekwa ahụ, Dọkịta Ahmed Audi enyela ndị isi steeti niile iwu ka ha mesoo onye ma ọbụ ndị ọ bụla ejidere na-emebi ngwongwo ọha na eze na mba ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *