Ụmụ nwanyi ndị ntụzịaka na egwuregwu bọọlụ ( female refrees) ‘kwesịrị’ ka enye ha ohere.
Chidi Nwoke dere ya na bekee.
Ụmụ nwanyi ndị ntụzịaka na egwuregwu bọọlụ ( female refrees) ‘kwesịrị’ ka enye ha ohere maka iso hazie egwuregwu bọọlụ Iko Mbaụwa, Mukansanga nke Rwanda kwuru.
Otu n’ime ndị ụmụnwaanyị atọ ga-abụ onye isi na asọmpi iko mba ụwa nke ụmụ nwoke na nke mbụ, Salima Mukansanga, kwuru na a họpụtara ha maka asọmpi a na Qatar ọ bụghị naanị na-adabere na okike ha kama maka na ha kwesịrị ohere ahụ.
Mukansanga nke Rwanda, Yamashita Yoshimi nke Japan na Stephanie Frappart nke France tinyere ụmụnwaanyị atọ ndị na-enyere aka n’ọkwa ikpe ka ahọpụtara maka asọmpi Iko Mbaụwa nke ga-amalite na Sọnde.
Leave a Reply