Take a fresh look at your lifestyle.

Nwada malitere inwe mmasị n’ọrụ ịrụzị na nhazị ụgbọala nke Bekee na-akpọ ọrụ ‘mechanic’.

chigo.

0 294

Otu nwaagbọghọ na-eme ihe na-atụ ọha n’anya akọwala ihe kara ya obi o jiri wụba ọrụ  na-atụ ụmụnwoke n’ọnụ ọ fọdụzie ụmụnwaanyị.

Nwada Ukoamaka Maluze malitere inwe mmasị n’ọrụ ịrụzị na nhazị ụgbọala nke Bekee na-akpọ ọrụ ‘mechanic’ mgbe ọ dị naanị afọ 15.

Ka o si kwuo, mmasị a malitere dịka ya na nne ya na-eresi ndị ọrụ ngo nakwa ndị ọrụ ‘mechanic’ nrị n’akụkụ Benue.

O kwukwara na ịgba nkiri ka ọ nọ na-eme ebe ahụ ma sizie n’ụzọ malite ịmụta ọrụ ahụ.

Nwada Maluze kwukwara na n’ihi ọ ka bụ nwata mgbe ahụ, ndị kuziri ya ọrụ ahụ anaghị ya ego ma kuziere ya ya bụ ọrụ n’efu.

Ukoamaka bụ onye Eziagu, Enugu steeti mana o bizi n’Owerri, Imo steeti ebe ọ na-arụ ya bụ ọrụ n’uju ugbua.

BBC-igbo.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *