Take a fresh look at your lifestyle.

COP27: UN adọọla aka na ntị maka ajọ mgbanwe eligwe dịka ọgbakọ ha na-amalita n’Ijipt

0 708

Odeakwụkwọ ugwu nke ọgbakọ United Nations adọọla aka na ntị maka ajọ mgbanwe eligwe chere ụwa n’ihu ugbua nke ọ sị na-akawanye njọ.

Antonio Guterres dọrọ ka na ntị a n’ọgbakọ COP27 malitere na Ijipt bụ ụka nke ndị isiala mba dị otu narị na iri abụọ (120) ga-abịa itinye ọnụ n’okwu etu a ga-esi kwụ ya bụ onye ukwu wara.

Guterres sị a ekpomọkụ nke afọ asatọ gara aga kacha njọ.

Mba ndị a ga-etinye ọnụ n’okwu gbasara ihe ha ga-eme iji gbochie ya bụ ajọ ihe nke mmetọ ihu eligwe nwereike ibutere mmadụ.

Onyeisi ya bụ ọgbakọ COP27 bụkwa minista ndị Ejipt na-ahụ maka mba ofesi bụ r Sameh Shoukry rịọrịọ ndị bịara ya bụ ọgbakọ ka ha ghara ikwe ka oke agụụ na ụkọ ọkụ nke agha Ukren na Rọshịa butere bụrụ ọgbauhie nye mkpebi gbasara nkwa ha nwere maka idozi ihu eligwe.

Ọ sị, “ọ dịara anyị niile bịara ọgbakọ a na Sharm el-Sheikh igosi na anyị maara ọrụ cheere anyị n’ihu nakwa mkpebi anyị imezu ya”.

UN’s World Meteorological Organization gbara ihe niile ọtụ nke gụnyere ehi niile e kwesiri ịme ka ihe dị mma.

Maazi Guterres zipuru ozi n’ihe onyonyo ebe ọ kpọrọ ya bụ akwụkwọ nchọpụta Global Climate Report 2022 “Usoro ọdachị nke ihu eligwe”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *