Take a fresh look at your lifestyle.

Etu anyị ga-esi mee ọnọdụ nchekwa n’Ọwụwa Anyanwụ- Ndi Gọvanọ

0 512

Ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa ekwuola ihe ha ga-eme iji kekpọọ ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ na mpaghara ahụ.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi ha wepụtara bụ nke onyeisi ha bụ Dave Umahi, gọvanọ Ebonyi Steeti gụpụtaara ndị ntaakụkwọ.

Ha mere mkpebi a n’ọgbakọ ha nwere n’Enugwu Steeti n’ụbọchị Sọnde iji leban anya n’okwu banyere nchekwa nakwa ihe ndị ọzọ metụtara mapaghara a.

Ndị bịara ọgbakọ ahụ gụnyere;

Gọvanọ Enugwu Steetị bụ Ifeanyi Ugwuanyi, Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti, Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi Steeti ma bụrụkwa Onyeisioche ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ, ebe a ndị osote Gọvanọ Anambra na Imo Steetị bụ Onyekachukwu Ibezim na Placid Njoku, nọchitere anya Gọvanọ Chukwuma Soludo na Gọvanọ Hope Uzodinma.

Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha kwuru

  • Ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ tiri mkpụ maka ọnọdụ nchekwa, ogbugbu ndị mmadụ, ntọrị mmadụ nakwa ihe ndị ọzọ. Ha kpọkuru gọọmentị etiti ka ha biko gbatara ha ọsọ enye ọkachasị ugbua ntuliaka na-abịa nso.
  • Ha kwekọrịtara na ndị ọrụ nchekwa ga na-akpagharị n’okpuruụzọ awarawa dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n’ụtụtụ, ehihie nakwa abalị.
  • Ha gakwara n’ihu kwuo na aka ha adịghị n’ihiwe otu nchekwa Eastern Security Network (ESN) kama na ihe ha hiwere bụ ‘Ebubeagu’ na ‘Forest Guard’.
  • N’okwu banyere Nnamdi Kanu, ndị Gọvanọ a sị na ha kwenyere na ọ bụ site n’ụzọ mkparịtaụka ndọrọndọrọ ọchịchị ka a ga-esi gboo nsogbu ịtọhapụ ya. Ha kwuru na ha na-ege ntị n’etu ikpe ya si aga.
  • Ndị Gọvanọ a gara n’ikwu kwuo maka etu idemmiri si akpa ike na mpaghara Ọwụwa Anwanyụ ma sị na ha ga-agbakọ aka ọnụ buo agha megide ya.
  • Ha gakwara n’ihu kpọkuo Gọọmentị Etiti ka a gbatara ha ọsọ enyemaka ha hiwe ụzọ mgbapụta n’okwu idemmiri a.

Cheta na ndị Gọvanọ a nwere ọgbakọ n’ọwa Eprelụ afọ 2021 ha ndị ọrụ nchekwa dị iche iche bụ ebe ha nọ hiwe ngalaba nchekwa a kpọrọ ‘Ebuagu’.

Ọrụ Ebubeagu bụ ichekwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ site n’aka ndị ohi, ndị ekperima ndị ntọrị, ndị ọchịehi na-egbu ndị mmadụ nakwa ndị ọzọ.

Kamgbe ahụ rute ugbua, a ka na-anụta akụkọ ntọrị nakwa ogbugbu ndị mmadụ na mpaghara dị iche iche maka ọ dizi ka ọ ka njọọ ugbua.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *