Take a fresh look at your lifestyle.

Onye Praịm Mịnịsta mba Briten agbaala arụkwaghị m

0 493

Praịm Mịnịsta ọhụrụ mba United Kingdom bụ Liz Truss, arịtuola n’ọkwa ọchịchị.

Truss nọrọ naanị abalị iri anọ na ise n’ọkwa ọchịchị tupu ọ gbaa arụkwaghịm.

Nke a mere ya Praịm Mịnịsta ọchịchị ya kacha dị nta na UK.

“Achọpụtala m na n’ihi etu ihe si kwụrụ ugbua, agaghị m enwe ike imezu ihe ndị m kwere na nkwa oge a họpụtara m dịka onyeisi otu ‘Conservative Pati’,” Truss kwuru.

“N’ihi nke a, agwala m ‘His Majesty’ Eze na aga m aritu dịka onyeisi ‘Conservative Pati.”

A na-atụ anya na a ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ndu ọhụrụ n’ime izuụka na-abịanụ, mana Truss ga-anọgid n’ọkwa ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ga-anọchi ya.

Ihe Liz Truss kwuru oge ọ rituru n’ọkwa PM

“Aga m na-arụ ọrụ dịka Praịm Mịnịsta ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ọhụrụ ga-anọchi m.” – Liz Truss

Liz Truss mere mgbasaozi n’ụbọchị Tọzde n’ihu ụlọọrụ Praịm Mịnịsta bụ 10 Downing ‘Street’.

O kwuru sị: “Abatara m n’ọchịchị n’oge ọnọdụ akụnụba na-ama jijiji na mba ụwa dị icheiche.”

“Ezinụlọ na ụlọahịa dị icheiche nọ na nchekasị etu ha ga-esi kwụọ ụgwọ dị icheiche ha ji.”

“Agha ọjọọ Putin na-aluso Ukraine amajaala ọnọdụ nchekwa nke mpaghara Europe niile.”

“Ọnọdụ akụnụba na-anaghị eto eto dọghachiri mba anyị azụ nke ukwuu.”

“Pati Conservative họpụtara m dịka onye ndu ka m gbanwee ihe ndị a, anyị gbalịkwara n’ihe gbasara ‘Energy’, nakwa iwetu ‘National Insurance’.”

“Anyị malitekwara atụmatụ ibutu ụtụisi ma mee ka ọnọdụ akụnụba gbalie, n’isoro nnwereonwe nke Brexit wetara.”

“Mana achọpụtala m na n’ihi etu ihe si kwụrụ ugbua, agaghị m enwe ike imezu ihe ndị m kwere na nkwa oge a họpụtara m dịka onyeisi otu ‘Conservative Pati’.”

“N’ihi nke a, agwala m ‘His Majesty’ Eze na aga m aritu dịka onyeisi ‘Conservative Pati.”

“N’ụtụtụ taa, mụ na onyeisi ‘1922 committee’ bụ Sir Graham Brady nwere mkparịtaụka, ebe anyị nọ kwekọrịta na a ga-enwe ntuliaka iji họpụta onye ndu ọhụrụ n’ime izuụka na-abịanụ.”

“Nke a ga-eme ka anyị nọsie ike n’ụzọ iwulite ma kwadosie ọnọdụ akụnụba nakwa nchekwa obodo anyị ike.”

“Aga m na-arụ ọrụ dịka Praịm Mịnịsta ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ọhụrụ ga-anọchi m.”

Etu nsogbu si malite

Truss na ndị omeiwu nwere nrụrịtaụka kporo ọkụ n’ụlọ omeiwu n’ụbọchị Wenezde

Nsogbu bidoro oge Truss chụturu Kwasi Kwarteng, bụ Chancellor UK, n’ọkwa ya n’ihi ụfọdụ atụmatụ o tinyere nke mere ka ọnọdụ akụnụba mba ahụ kawanye njọ.

Ka nke a mechara, ụfọdụ ndị omeiwu nọ na pati ‘Conservative’ gwara Truss ka ọ rituo n’ọkwa Praịm Mịnịsta n’ihi na ndị mmadụ enwekwaghị ntụkwasị obi n’atụmatụ ndị ọ na-ewepụta.

Omeiwu Jill Mortimer so na ndị wepụtara akwụkwọ nkatọ ma kwuo na ya enweghị ntụkwasị obi n’ọchịchị Truss.

N’ụbọchị Wenezde, enwere nrụrịtaụka kporo ọkụ n’ụlọ ọgbakọ ndị omeiwu dịka n’etiti Liz Truss na ndị pati Labour.

Mana Truss kwechiiri na ọ gaghị aritu n’ọkwa. “Abụ m dike ọgụ, abụghị m onye ụjọ ọgụ,” Truss kwuru.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *