Otu n’ime ndị ozi Atiku Abubakar bụ onye ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023 bụ Muhamed Sanusi Hassan ekwuola na ọnweghị ihe na-eme onyeisi ya bụ Atiku dịka Femi Fani Kayode dere n’akara Twitter nakwa Facebook ya.
Fani-Kayode sị na sị na anya ajụ buru Atiku ma ọ daa n’ọdọụgbọelu dị n’Abuja mgbe o si Kaduna steeti lọta.
N’ebubo ahụ, Fani-Kayode kwuru na mgbe ha nọ n’ụgbọelụ ka Atiku na-ekwu na oke isi na-awa ya.
Ọ sị na ngwangwa ha ruru Abụja ka ndị otu ya fepuru ya ka ọ gaa Fransị maka ọgwụgwọ.
Atiku na ndị isi ndọrọndọrọ ndị ọzọ gara Kaduna maka ọgbakọ achụmnta vootu nke dị okenye mpaghara ugwu Naịjirịa bụ ‘Northern Elders Forum’ haziri.
Aha onyonyo, Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n’ọbaozi ndị ọzọ.
Sanusi Hassan bụ onye mgbasaozi Atiku na sosha midia gwara BBC nke a n’ekwentị n’ụtụtụ bụ Wenezde.
Ọ sị na, “Femi Fani-Kayode abụghị onye anyị ga-eji okwu ya kpọrọ ihe, ọ bụ ihe doro onye ọbụla anya”.
Hassan sị na nke bụ eziokwu bụ na Atiku si Kaduna bata Abuja ma sizie ebe ahụ gawa mba Fransị ozugbo maka mkparịtaụka ya na ndị ọzọ na ndị ntaakụkọ nwere.
Ndi ntaakuko gwara ya ka ọ zitere anyị ihe onyonyo Atiku ebe ọ gwara ndị Naịjirịa na ahụ dị ya mma.
Mana Hassan sị na “nke ahụ abaghị uru maka na ọ bụ onye ahụ adịghị na-ekwu na ahụ dị ya”..
O kwukwara na ndị otu ziputara foto ebe Atiku na ndị mmadụ nọ iji gosi na ahụ dị ya mma.
Ọ sị ndị mmadụ egekwala ndị otu PDP ntị maka ihe ọ kpọrọ mmegharị anya ha na-emeghari ndị mmadụ.
Ndi ntaakuko Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n’ọnụ Fani-Kayode ebe o si nwete akụkọ na ahụ adịghị Atiku Abubakar.
Leave a Reply