Cocoa: Ndị ọrụ ugbo 68,000 na Nigeria ga-erite uru na aka U.S.
Ndị ọrụ ugbo Naijiria ruru 68,000 na Abia, Cross River, Ekiti, Akwa Ibom, Ondo na Osun Steeti ga-erite uru na ntinye aka United States na oke ọnụ ahịa koko nke obodo.
Mmemme U.S. Department of Agriculture’s Food for Progress gosipụtara nke a na nkwupụta na-eso nkwekọrịta nkwado ya na Lutheran World Relief iji wusie mmepụta koko na Nigeria ike.
Nkwupụta ahụ kpughere na a ga-emejuputa mmemme a, nke ruru nde $22, n’ime afọ ise na-abịa.
N’ikwu okwu, onye ndụmọdụ maka ọrụ ugbo, US Mission Nigeria, Dr. Gerald Smith, kwuru na ọrụ a ga-elekwasị anya ka ndi oru ugbo were rụpụta ihe hiri nne.
Leave a Reply