Take a fresh look at your lifestyle.

PVC 90,000 anakọtaghi na Steeti Cross River – INEC.

Nnenna okoro dere ya na bekee.

0 534

PVC 90,000 anakọtaghi na  Steeti Cross River  – INEC.

Ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission, INEC, na-ekwu na a ka na-anakọta ihe karịrị kaadị 90,000 Permanent Voter Card n’okpuru ọchịchị ime obodo iri na asatọ dị na Steeti Cross River .

Kọmishọna na-ahụ maka ntuliaka na Cross River, Dọkịnta Johnson Alalibo nyere nkọwa a mgbe ọ gara nleta nkwanye ugwu na  nke gọvanọ, bụ  Prọfesọ Ben Ayade na Calabar, isi obodo steeti ahụ.

Dọkịnta Alalibo, bụ onye kelere gọvanọ maka nnabata ahụ, katọrọ mmeghachi omume nke ndị mmadụ na-eji nwayọọ na-anakọta PVC, na-ekwu na “kamgbe malitere ndebanye aha ndị ntuli aka na nso nso a, anyị na-agba ndị ọha na eze ume karịsịa ndị, bụ ndị debanyere aha ka ha bịa were PVC ha. Anyị nwere kaadị karịrị puku iri itoolu a na-anakọtaghị na steeti Cross River.

“Ọnụ ọgụgụ ndị a abụghị na Calabar naanị, kama n’ofe ime obodo 18 na steeti ahụ. Anyị na-emeghe ụlọ ọrụ gọọmentị ime obodo anyị kwa ụbọchị iji kesaa ndị mmadụ PVC ndị a, n’oge na-adịghị anya, anyị ga-anata ogbe ọzọ, nke anyị na-arịọ ndị mmadụ ka ha bịa were were.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *