Take a fresh look at your lifestyle.

Ụfọdụ agha nwereonwe ndị Igbo lụrụ megide ndị ọcha mgbe gboo

0 499

Site na mgbe mgbo, ndị Igbo bụ ndị a ma ama na-agbasi mbọ ike n’ụzọ dị iche iche gụnyere azụmaahịa, ọrụ ugbo na ihe ndị ọzọ.

Nke a mere ka ha bụrụ ndị nwere oke mmasị n’ịkwụrụ onwe ha na-adabereghi na onye ọbụla.

N’ihi ya, ọtụtụ ndị Igbo si n’obodo dị iche iche siri ọnwụ ma lụọ ọgụ oge ndị ọcha chọrọ ịbata obodo ha ịchị ha.

E meriri ha n’ụfọdụ agha ndị a nke mere ndị ọcha jiri nwee ohere bata ma were ọnọdụ. Ụfọdụ agha ndị a gụnyere;

Agha Ekumeku

Nke abụ agha ndị mba Briten na ndị obodo Anioma nke dị na Delta steeti lụrụ oge gboo.

NDị Anioma gbochiri ndị Briten site n’afọ1883 ruo 1914.

Emeka Esogbue bụ onye ọnụ na-eru n’okwu maka akụkọ ihe mere eme kwuru na ọ bụ mgbe ndị mba Briten hiwere ụlọọrụ nke gbanwere etu ndị Igbo si ebi ndụ butere ya bụ agha.

Ndị Anioma ji ube na ụta lụọ ya bụ ọgụ ebe ndị Briten ji egbe.

Ọ bụ ụfọdụ obodo dịka Kwale, Ubulu-Uku, Ọgwashị-Uku, Asaba na Igbuzo bụ ụfọdụ ndị soro lụọ ya bụ ọgụ.

Ugwu Ntijiegbe –  Ndị obodo Achị

Onye ọnụ na-eru n’okwu maka akụkọ ihe mere eme bụ Dọkịnta Mcgregor Ibeneme kọwara maka agha ndị obodo Achi na ndị ọcha lụrụ.

Ibeneme kwuru sị, “ Ndị obodo Achị chụpụrụ ndị ọcha site n’ọgụ oge mbụ ha chọrọ ịbata ala ha”.

O kwuru na dịka akụko ndị obodo Achị na-akọ na ndị Briten mechara lọhachi were kpọọ ụmụnwoke obodo Achị nzụkọ.

Ibenem kwuru sị, “ Mgbe ndị ụmụnwoke Achị bịara nzụkọ a ka ndị ọcha gbara ha gburugburu, napụ ha ngwa egbe, tijiesie ha ma gbuo ọtụtụ ụmụnwoke ndị a”.

Ya mere ndị obodo Achi jiri nwee ugwu ha na-akpọ ‘ugwu ntijiegbe’ ruo taa.

Agha ndị Arochukwu

Nke a bụ agha ndị Arọchukwu na ndị mba Briten lụrụ site n’afọ 1901 ruo afọ 1902.

Ndị Arochukwu lụrụ ya bụ agha dịka ha chere na ndị mba Briten chọrọ ịnapụ ha ikike ịchị onwe ha dịka obodo kwụụrụ onwe ya.

Ngagharịiwe Ụmụnwaanyị Aba

 

Ụmụ nwaanyị Aba mere ngagharịiwe nke wuru ewu n’ebe niile oge ahụ.

N’afọ 1928, ndị ọcha mba Ịngland na-achị Naịjirịa malitere ịnakọ ụmụnwoke ụtụisi.

Ha na-ezipu ndị mmadụ ka ha kpagharịa n’ụlọ n’ụlọ gụkọọ ụmụnwoke.

Mana n’afọ 1929, ndị ọchịchị nyere iwu na ụmụnwaanyị nakwa anụ ụlọ ga-eso n’ihe a na-agụkọ iji gbakọọ ụtụisi.

Nke a ekweghị ụmụnwanyị odidi chaa chaa n’ihi na ihe siri ike oge ahụ; ha wee foro ntutu taa, gbakọọ ọnụ wee malite ngagharịiwe.

Otu n’ime ndịisi ụmụnwaanyị ahụ so hazie ‘Aba Women Riot’ bụ nwaanyị a kpọrọ Nwanyeruwa.

Dịka akụkọ si kwuo, Nwanyeruwa wụ onye Ngwa mana ebe a lụrụ ya wụ n’Oloko.

Ndị ọzọ bụ Ikonnia, Nwannedia na Nwugo.

Onye nke ọzọ bụ Mary Okezie nke a sị bụ nwaanyị Ngwa mbụ gụrụ akwụkwọ.

Okezie esoghị mee ngagharịiwe ahụ mana ọ bụ ya dere akwụkwọ degara otu e hibere ka ha nyochaa ihe kpatara ya bụ ngagharịiwe.

Ngagharịiwe a rukwara obodo dịka Ikot-Abasi nke dị n’Akwa Ibom Steeti.

Ọ bụ eziokwu na ihe karịrị ụmụnwaanyị iri ise nwụrụ na ya bụ ngagharịiwe ka ndị uweojii bịara jiri egbe chụsasịa ha ma gbaa ha egbe, mana ọ mịtara mkpụrụ.

O mere ka ndị ọcha na-achị oge ahụ mata na ụmụnwaanyị abụghị ofe nkupu.

Ngagharịiwe ahụ mekwara ka otu ụmụnwaanyị siwanye ike na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *