Take a fresh look at your lifestyle.

Etu nsogbu si n’etiti Ann Agom-Eze na Umahi

0 630

Ann Agom Eze, bụ onye na-azọ ikike ife ọkọlọtọ APC iji nọchite Ebonyi South n’Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria, akọwaala ihe na-esere ya na Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi n’ihi okwu ndọrọndọrọ ahụ.

Oriaku Agom Eze kwuru na ọ bụ ya ka o rutere ịzọ ọkwa ahụ n’ihi na Austine Umahi onye meriri ntuliaka imeụlọ maka ọkwa ahụ ekwuola na ya chọrọ iritu ka nwanne ya bụ Gọvanọ Dave Umahi werezie ya bụ ọkwa.

Etu esemokwu siri malite

Ann Agom-Eze zọrọ ohere ife ọkọloto APC maka ọkwa Sinetọ ga-anọchite Ebonyi South na ntuliaka imeụlọ pati ha bụ APC mere .

Mana nwanne Govanọ Dave Umahi nke obere bụ Austin Umahi gbara onye nke mbụ, ebe Agom Eze gbara onye nke abụọ.

Oge ohere ịzọ ọkwa onyeisiala kwara Dave Umahi, nwanne ya nwoke bụ Austin rituru ma nyefee ya ikike ịzọ ọkwa sinetọ n’aha APC.

Mana Inec anabataghị nke a n’ihi na Umahi esoghị mee ntuliaka imeụlọ ọbụla.

Umahi gara gbaa akwụkwọ n’ụlọikpe si ka ụlọikpe nye ntuziaka ka Inec tinye aha ya n’akwụkwọ dịka onye ga-efe ọkọlọtọ APC maka ọkwa ahụ.

Agom Eze gakwara rịọ ka etinye aha ya n’ikpe ahụ dịka onye ya bụ ikpe metụtara.

Okaikpe kpere ikpe ahụ kwuru na o megidere iwu otu onye ịzọ ọkwa abụọ n’otu afọ ma nye Agom Eze mmeri dịka onye nwere ikike ịzọ ọkwa ahụ n’aha APC.

Mana ka ọ dị ugbua ya bụ okwu ka dị n’ụlọikpe mkpegharị, ebe a ga-ekpebi ya n’ụbọchị asaa nke ọnwa Septemba.

Ihe i kwesịrị ịma maka Ann Agom-Eze

Ann Agom Eze bụbu onye ọrụ oyibo tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị

Agom Eze bubu odeakwụkwọ ukwu (Permanent Secretary) na Ministri na-ahụ maka ala.

Ya na di ya bụ Sam Agom-Eze bụ nwaeze ji ụmụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *