Mercy Chinwo,bu onye eji igụụ egwu mara na-achaba mmadụ anya
Mercy Chinwo bụ onye na-eti egwu ụka na Naịjirịa ama ama.
N’ajụjụ ọnụ a gbara ya n’afọ 2012 mgbe o meriri nturugo “Nigerian Idol”, Chinwo kwuputere ihe ndị a maka onwe ya.
- Chinwo toro na PortHarcourt
- Ọ bụ onye Ikwerre dị na Rivers Steeti
- Ọ gụrụ “Linguistic and Communication” na mahadum PortHarcourt
Ihe e jiri mara Mercy Chinwo bụ ịgụ egwu okwukwe Kraịst
- Ọ gụrụ akwụkwọ primari na Sekọndịrị ya na PortHarcourt
- O meriri asọmpi “Nigerian Idol” n’afọ 2012
- O kwuru na ihe na-amasị ya nke ukwu bụ igba ndị ntoroọbịa ume ka ha wee bụrụ mmadụ.
- Nne na nna ya mụrụ ha isii dịka Mercy bụ onye nke anọ
Leave a Reply