Take a fresh look at your lifestyle.

Ndi agha anwụchiela ndi mere ọdachi ụlọ ụka Owo

0 496

Ndi agha ala Naijiria anwụchiela ndi butere odachi n’ụlọ ụka St. Francis Catholic Church nke Owo dina Steeti Ondo,mpaghara South West,ala  Niajiria.

Onye Chief of Defence Staff bụ, General Lucky Irabor mere ka amata nkea dika onwere nkparita ụka yana ndi ntaakụkọ na Abuja isi obodo Naijiria.

Onye Defence Chief kwuru na “ndi omekome a ka ndi agha nwụchiri site n’enyemaka ndi ọrụ nchekwa ọzọ”. I ga echeta n’abali ise nke ọnwa Juue afọ 2022,na ndi omekome wakpuru ụlọ ụka ebe ndi mmadu na ekpe ekpere ma gbuo ihe kariri mmadu iri atọ.

Dika osi kwuo,ndi ọrụ DSS, Police nakwa ndi ọrụ nchekwa ndi ọzọ nyere aka inwuchi ndi ọjọọ a.

O mere ka amata na Idris Abdulmalik Omeza bụ onye hụrụ ma nkusua mere na Saint Francis Catholic Church, Owo na ọnwa Juun nakwa nkusu mere na ụlọ ọrụ ndi uwe ojii na Steeti Kogi bụ nke tara isi otu onye uwe ojii.

General Irabor gara n’ihu kwuo na ndi omekome agaghi emery n’ala Naijiria,na ihi na ndi agha ga-eme ihe nile ha nwere ike ime iji weta udo ,gunyekwa na ntuliaka nke afọ 2023 ga-abia na nmezu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *