Take a fresh look at your lifestyle.

Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri onyeisi ndi al-Qaeda

0 482

Mba Amerịka egbuola onyeisi otu ndị agha nnupụisi nke al-Qaeda, bụ Ayman al-Zawahiri dịka ogbunigwe ụgbọelu ha tugburu ya n’Afghanistan

E gburu ya n’isiobodo mba ahụ bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA nọ n’ọrụ nchekwa ebe ahụ.

Al-Zawahiri gbara afọ iri asaa na otu nọchịtereanya Osama Bin Laden n’otu al-Qaeda dịka ha abụọ kpakọrọ nkata mwakpo mba Amerịka na afọ 2011.

N’ozi onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden, o kwuru:

“Zawahari ji ogbugbu na tigbuo zogbuo nke ndị nkiki mba Amerịka meere onwe ya aha”

“Ugbua ikpe ziri ezi abịarala ya dịka e meminala ya”

E kwuru na Zawahiri bụ onye mba Amerịka depụtara dịka onye a na-achọsịike kemgbe nọ ezi be ya zoro ezo mgbe ogbunigwe ha tụrụ ya.

Agbanyeghị na ya na ezinaụlọ ya nọ, enweghị onye ọzọ ya bụ ogbunigwe tụtara na abụghị ya.

Biden kwuru na ọ bụ ya nyere ndị ọrụ nchekwa ikike ịtụ ya bụ ogbunigwe dịka otelaa ha na-akpa nkata iwakpo ya.

O kwuru na ogbugbu ya ga-adaju obi ịnụ ọkụ dị n’ebe ndị mwakpo mba Amerịka nke afọ 2011 metụtara nọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *