Naijiria gara n’ihu mee nwakpo megide Polio-VP Osinbajo.
Osote onye isi ala bụ Yemi Osinbajo na-ekwu na Naijiria anọgidewo na-ebuso nje polio ọgụ iji hụ na ọ gaghizi n’iru.
Ọ sịrị; “Gọọmentị Naịjirịa , ọkachasị n’ime afọ ole na ole gara aga, ejirila ya kpọrọ ihe nke na-akọwa ihe kpatara ugbu a anyị ji kwụsị ọrịa polio.”
Ọkammụta Osinbajo kwuru nke a na Tọzdee mgbe ọ natara onye na-eme njem na Naijiria, Kunle Adeyanju, bụ onye ji igwe kwụ otu ebe dị kilomita 12,000 site na London gaa Lagos.
Adeyanju malitere njem ahụ iji dọta uche na mkpa ọ dị ịnọgide na-ebuso ọrịa polio ọgụ n’Africa.
Prọfesọ Osinbajo nabatara Adeyanju na ndị otu ndị na-agba ígwè ya n’ụlọ ọrụ ya, Akinola Aguda House, Presidential Villa, Abuja.
Leave a Reply