Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ ọrụ mgbochi ọgwụ ọjọọ na-egbochi heroin si South-Afrika.

Salihu Ali, Abuja dere ya na bekee.

0 591

 

Ụlọ ọrụ mgbochi ọgwụ ọjọọ na-egbochi heroin si South-Afrika.

Ndị na-arụ ọrụ nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka mgbochi ọgwụ ọjọọ na Naijiria bụ National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA, ejidela blocks 22 nke heroin dị kilogram 23.55 nke e zoro n’ime ngwugwu nri Nestle Cerelac n’ọdụ ụgbọ elu Murtala Muhammed International Airport, MMIA, Ikeja, Lagos.

Ngwongwo ahụ dị ihe karịrị ijeri naira anọ (N4.5billion) sitere na Johannesburg, South Africa n’ụgbọ elu South African Airways na Wednesde 29th Juun dịka akụkụ nke ngwongwo jikọtara ọnụ nke rutere n’ọdụ ụgbọ elu SAHCO na-ebubata ọdụ ụgbọ elu Lagos.

Tupu ejide Chike, ndị ọrụ NDLEA nọ n’ọdụ ụgbọ elu ahụ na Mọnde 27th Juun nwụchiri onye bụbu ọkwọ ụgbọ ala na ụlọ ọrụ njem ọha, BRT, Muyiwa Babalola Bolujoko maka ịtinye pellet  iri itọọlụ nke cocaine.

“E jidere ya n’ebe a na-enyocha ya tupu ọ banye ụgbọ elu Qatar Airways na-aga Doha na Sharjah, na njem ya ga-akwụsị na Dubai, UAE.”

Nkwupụta ahụ kwuru na onye dị afọ iri atọ na- itọọlụ sitere na Ijebu South LGA, Ogun Steeti, bụ onye e debere n’okpuru nleba anya mgbe nsonaazụ nyocha ahụ gosipụtara na ọ bụ ọgwụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *