Nghọgbụ njem mbiri, mwakpo n’ọnọdu nhuju anya”, agba nke mbu.
Nke
Amarachukwu Nwanguma depụtara
Mmalite:
Onye nta akụkọ anyị mere ka amata otu akụkọ nnyocha pụrụiche,gbasara di na
nwunye otu ikwunibe ha bi Mba Ofesi ghọgbụrụ ịbịa njem mbiri na Mba Italy
n’ejighi akwụkwọ ikikere njem, ụdị nhuju anya na ntaramahụhụ ha nwetara
n’otu, n’otu site na ụdị njem a.
Nghọgbụ ịga njem
Dịka ọtụtụ ndi ntorobia ọ nanụ ọkụ n’obi, ha gara njem n’enweghị akwụkwọ
ikikere njem ma dabanye n’aka ndi oji mmadụ atụ mgbere ahịa, ndi ahịa ọgwụ ike
na ndi n’ere mbaghara ahụ mma.
“Agam eme ihe ọ bụla mmadụ dị ndụ kwesiri ime, ma letakwa ezinaụlọ m. Kedụ
ka nwoke gaa-eji nọrọ ndụ n’ele ụmụ ya n’agụụ ma o nweghị ihe o nwere ike
ļ mee’’?…Obinna Udekwe, onye di afo iri atọ na ano gwara onye nta akụkọ Voice of
Nigeria bụ Amarachukwu Nwanguma.
Obinna bụ nwafọ Abu Agu dị n’okpuru ọchichi ime obodo Nando nke Steeti
Anambra. Mana ya na onye nta akụkọ anyi kparitara ụka na Lugbe nke dị n’ime
ime ọchịchị obodo nọọ n’Abuja bụ isi obodo Naijiria, ebe ya na ezinaụlọ ya mmadụ isii bị. Ọ n’arụ dika onye oje ozi n’otu ebe a na- ere anụ aghụrụ n’ọkụ
Obinna gara Mahadum Nnamdi Azikiwe di n’Awka na Steeti Anambra,ebe ọgụrụ
ihe bekee n’akpọ Classical Music ma tụrụ Asambodo n’afo 2011.
Ngwa ngwa ofesiri ala Nna ya, nke a na-akpọ National Youth Service Corps NYSC,
n’afọ 2013 ojeghariri okporo ụzọ nile ọ mara n’Abuja ebe ọ n’achọ ọrụ na ngalaba
ndị ọrụ nchekwa nke obodo dịka o sịrị mmasị ya, mana onwetaghị.
N’oge a ka ojiri hụta nwa agbọgho bụ Azuka Perpetua ha were lụọ di na nwunye
ozugbo. N’ime afọ abụọ dị n’iru , Chineke jiri ụmụ abụọ gọzie ha.
Ka ezinaụlọ n’etolite, Obinna n’achọzi ọrụ n’ike n’ike iji leta ezinaụlọ ya. Ọ bụ
n’oge a ka echiche ya gara ebe nwa nwanne nna ya bi n’Italy aha ya bụ Emeka
irọọ ya maka enyemaka.
Emeka atụfụghị oge ịkọrọ ya ihe ọma jụpụtara na mba Europe, ma kpọkuo ya
ịbata bịa biri .
Obinna gbapụrụ ọsọ ga weta akwụkwọ nkọwa onwe, eji aga mba ofesi, ma jeekwa
n’ụlọ Embassy Italy ozugbo ozugbo ebe otinyere akwụkwọ ị nwee ohere ịga mba
Italy mana onweghi isi.
Ka Obinna enweghị ike ịnweta Visa dịka oyibo sị akpọ ya, ọ kpọrọ Emeka ọzọ, rịọ
ya ka o tinye aka ịnwetara ya Visa mba Italy, ebe ọ bụ na o biela Italy ọtụtụ afọ.
Emeka gwara ya na nkea adịghị mfe, ma kọrọ ya maka obodo anakpọ Libya na otu
ọ sịrị dịrị mfe isite Libya bata Europe n’egbughị oge. Ọ gara n’iru kọrọ Obinna na
ngwa ngwa orutere ọzara akpọrọ Sahara Desert, ọbanye osimiri anakpọ
Mediterranean Sea n’ime otu awa ma ọ bụ abụọ ọbatala Mba Europe.
Obinna sịrị na ya chere ya ezigbo echiche ka o siri dịrị ya mfe isite n’ụzọ osimiri aga mba ofesi, ma kpebie itulegharị ụzọ ndi ọzọ iji banye mba Europe.
N’ime afọ 2014 nile, Emeka n’akpọ Obinna n’ekwe ntị kwa mgbe kwa mgbe
ị nabata isite mba Libya abata Europe mana Obinna enweteghị.
Ka o chegidere afọ ahụ agwụ n’enweghị ebe enyemaka si pụta, nwunye na
ụmụntakiri ya nọrọ n’ahuhu na ahụghị tụtụrụ rachaa.
Nke a kpaliri mmụọ Obinna o were tụlewa isonye ndụmọdu Emeka ibanye mba
Italy.
Ọ kpọwa Emeka n’ekwe nti ịgwa ya na ya anọrọla na njikere ịbịa njem a mana
ọ zaghi ya, n’ihi na ọ na-ewere ya iwe na ọ na-eme anya ụra.
E mesịa, Emeka were zaghachi ya ka ọtụtụ izu gasịrị, ma nye ya aha n’akara ekwe
ntị otu nwoke a na-akpọ Razaq, nwafọ Ghana bi n’Agadez nke Niger Republic.
Dika Obinna mere ka anyị mata, Emeka nyere ya ndụmọdụ ikpọrọ nwunye ya gaa
njem a, n’ihi na ọ sịrị na ọ ga-adịrị ha mfe ịnweta akwụkwọ ikikere njem mbiri ma
ọ bụrụ n’ahụta ha abụọ dika di na nwunye oge ha ruru ọrụ obere oge n’Europe. Ka
obi aṅụrị jụpụtara Obinna n’ụdị akụkọ agbamume Emeka nyere ya, ọ kọrọ nwunye
ya ji asambodo Mahadum na Public Administration, tinyekwara otu enyi ya
nwoke guru Computer Science na Mahadum aha ya bụ Jubril Abubakar onye
Bassa di na Steti Kogi ka osonye ha na njem a.
N’egbughị oge, ha tinyekọtara aka nweta ego ma palie njem a ozigbo.
Mmalite ndụ ọhụụ
Obinna na nwunye ya hapụrụ ụmụntakiri ha dị afọ abụọ na onwa iri n’aka nlekọta
nne na nna nwunye ya bi na Suleja dị na Steeti Niger na mpaghara north central
nke ala Naijiria.
Ha banyere mba Sokoto, gbanwee ego Naira na CFA ma gafee oke ala di na Ilela
bata na Koni dị na Niger Republic.
Ka ha rutere n’ime motor park a na-akpọ Rainbow Park di na Koni, ọtụtụ ndi ji
mmadụ atụ mgbere ahịa jụpụtara n’ebe a, ma ndi isi ọcha ma ndi isi ojii. Ha
na-akpọ ndị mmadụ ka ha banye ụgbọala n’aga Libya. Obinna sịrị na ha banyere
ụgbọala a na-akpo “3S TV” , ebe na June 21, 2016.
Ha nọrọ abali atọ n’okporo ụzọ ahịa Trans-Sahara tupu ha abata Agadez.
Obinna n’olu iwe siri na ndị ji mmadu atụ mgbere ahia nabatara ha ngwa ngwa ha
batara Agadez. Oge ha jụrụ ase ndị sii n’aka Razaq bịa, ekechịrị ha anya ma kwọpụ
ụgbọala. Ka ụgbọ buru ha rutere n’otu mbara ezi ejiri mkpọchi igwe gbachie
ewepụrụ ihe ejiri kechiee ha anya.
ihe kariri puku mmadụ atọ sitere na mpaghara mba Africa dịgasị iche iche
juputara ebe a, ụmụokorobia, ụmụagbọghọbịa, ụmụnwaanyị dị ime na kwa obere
ụmụaka.
Ka ha husiri onye a na-akpo Maazi Razaq, Obinna sịrị na ọ gwara ha n’ego ha ga-
akwụ iji rute mba Libya bụ puku naira iri asaa (#70,000).
Ebe Obinna ejirughi ego a, o kporo nwanne ya nwaanyi bụ Uju bi na Nando otu
ọchịchị n’ime obodo dị na Steeti Anambra ka ọgbatara ya ọsọ enyemaka.
Na-egbughi oge, Uju zitere ya ego ahụ nke Razaq natara na-egbughi oge.
Iji gafee ọzara, aga achọ ụgbọala ruru otu nari, ya mere eji jiri abali ole na ole
gbuo Obinna, nwuye ya na enyi ya oge tupu ha agawa ya bụ njem.
Ndị ọkwọ ụgbọala gwara ndi njem ka ha buru mmiri ga eru lita iri ise dịka usoro
nkwado ha maka njem ahụ, mana ụfọdụ n’ime ha chere na nke ahụ abaghị uru
ọ bụla. Obinna bụ otu onye n’ime ha.
Kama і buru mmiri dị lita iri ise ụzọ abụọ maka ya na nwuye ya, Obinna buru mmiri di nnani lita iri atọ na ise.
Ọ chọghị ihe ga-akpagbu ya na njem ahụ, mana nke a bụ otu ihe ga-ebutere ya
ị kwa ngara mara.
N’ụbọchị akara aka, ndị njem mmadu iri atọ ka etinyere n’azụ ụgbọala Toyota
Hilux ọ bụla ibu ha baa n’ọzara na- enweghi ohere mgbati ụkwụ ọ bụla nye ha.
Ka ọ gara naani otu awa ha malitere njem, oke okpomọkụ dakwasara ha nke mere
ka Obinna na nwunye nụcha mmiri dị lita anọ.
Obinna sịrị na ya chetara otu ụbọchị n’okporo ụzọ otu nwokorobia toro ogologo
dabere n’ubu otu nwaanyị onye mba Mali na-arahụ ụra.
Nwaanyị metụrụ ya aka ka o teta mana ọ zaghị. Ọ bụ ihe ịgba anyammiri na-
achọpụtara na nwokorobia ahụ anwụọla pii, eleghi anya n’ihi oke okpomoku na
akpịrị ịkpọnkụ.
“Onye ọkwọ ụgbọala ahụ tufuru ozu ya dịka nkanka akwa. Ndi njem ahụ niile
malitere tiwe mkpu n’olu ike ka elie ozu nwokorobia ahu.
Onye ọkwọ ụgbọala ahụ n’olu ịkwa emo juru ha ebe ha ga-esi enweta ike igwu ili
ebe ike gwuru ha niile ma nọrọkwa n’akpịrị ịkpọnkụ”? Ha malitekwara njem ha.
Obinna kwuru na ozu ndị mmadụ na ụmụanụmanụ nwụrụ anwụ juputara n’uzo
ahụ ebe onye ọkwọ ụgbọala na-agba dịka onweghị ihe gbasara ya.
“Ka ha noogoro otu izu ụka n’ọzara, mmiri ha bu gwuchara na-erubeghi ebe ha na-
eje. N’ihi akpịrị ịkpọnkụ sitere na-oke anwụ ọchịcha, ha malitere ịnụ maamiri ha
mana arịọ ibe ha maamiri”.
Ka rutere na Dirkou, ebe otu mba uwa bu United Nations gwuru olulu mmiri, onye
ọkwọ ugboala kwusiri ma gwa ndi njem niile ka rituo jee nuo mmiri.
Dika Obinna si kwuo, ihe ruru otu puku mmadu si n’ugboala di iche iche gara na
ya bu olulu mmiri inu mmiri ruo mgbe afo juru na-atughi uche ozu na-eseghari
n’elu mmiri ahu.
O kwuru na ya na nwunye ya, enyi ya, na ndi ozo nujuru mmiri afo, na-eleghi anya
isi na ucha mmiri ahu ma gbajuo jerry can ha mmiri wee malitekwa njem ha.
Ezigbo mkpagbụ na mwakpo n’ike
N’ime nkeji iri ato ha ji si Dirkou puo, ha rutere n’okeala mba Niger Republic ebe
ndi nchekwa mba ahu ana-akpo Gendarmes kwusiri ha.
Ndi oru nchekwa ahu juru ha ebe ha na-aga, ozugbo ha kwuru na o bu mba Libya,
ndi oru nchekwa ahu nyere ha iwu inyefecha ha ihe niile ha ji gunyere ola aka,
ekwenti, mgbaaka na ego.
Nke kachasi njo bu na ha dinara umunwaanyi ha n’ike ma kuo ha bu umunwoke
ihe tinka kuru pan.
“Akasirim nwunyem na ụmụnwanyi ndi ọzọ obi ka ha dibe nke a n’ihi na enwerem
olileanya na ebe anyi n’aga kariri ebe anyi nọ n’oge a. Ahutubeghi udi mkpagbu di
etua na ndu ya. Obinna siri n’olu iwe.
Na Madama, obodo di n’okeala mba Niger Republic na Libya, ihe kachasi igba
anya mmiri mere.
Ekewara ụmụnwoke na ụmụnwanyi, Obinna siri na ha napụrụ ya nwunye ya,
onweghi ihe ọpụrụ ime.
Mbata na Libya
Ụgbọala bu mmadu iri na atọ hapụrụ obodo Agadez rutere mba Libya n’abalị abụọ
nke ọnwa July afọ 2016, ka ọ gachara abalị iri abụọ na anọ oge nhuju anya
n’ọzara.
Naanị mmadụ iri abụọ na otu rutere Libya, ụmụnwoke iri na asaa na ụmụnwaanyị
anọ.
Nwunye Obinna bu Azuka di afo iri ato na abụọ, gbakwunyere ihe di ya kwuru na
Emeka ghogburu ha isonye na njem ahụ gara egbufu ha.
O kwuru na ka ha rutere mba Libya ka ha chopụtara na ekwesịrị ịnwe onyendu ga-
anabata ha mana ka ha enweghị, ya na di ya na enyi ya bụ Jubril dabara n’aka ndi
ji mmadụ atụ mgbere ahịa bụ ndị rere ha.
Azụka nwere ihu ọma na ndi a ji mmadụ atụ mgbere ahịa ezigaghị ya n’ụlọ ebe
A na-akpo “connetion house” ebe eji umunwaanyi enweta ego site n’ịgba akwụna.
Ebe ahụ ka onye ahụ ga -anọ ruo mgbe okwuchara ego eji agbapụta ya.
Mana nkea apụtaghị na ọ dịrị ya mma ịgbara nwaanyị ahụ zuru ya odibo.
N’eziokwu, ọ n’arụ ọrụ ụbọchi niile, abali asaa nke otu izu, n’eri obere nri ,
enweghị ego ụgwọ ọrụ a na-akwụ ya.
“Ọtụtụ mgbe obere nri a na – enye m na a bụ n’oge abali”.
Ọ gbakwunyere na di ”Madam” ya ọtụtụ mgbe chọrọ iwakpụ ya n’ike mana
ọ riọrọ ya na ya nọọ na di, nwee ụmụ abụọ ma ka n’enye nwa ara tupu ọ malite njem a.
O mekwara ka amata na ọ bụ sọsọ ụgboro abụọ ka ya na ụmụnwanne ya ndi nke
nwoke kparịtara ụka site na Facebook, ha were gwa ya chọwa ụzọ lọta Naijiria.
Oge o ruru Madam na ezinaụlọ ya chọrọ ịga njem ezumike, ọ gwara ya na ya ga-
etinyere ya aka ịgafe mba Europe ma ọ bụrụ na ọchọ, ma ọ bụ nyefee ya n’aka ndi
resiri ya ka ha kpọga ya n’aka onye ọzọ.
Azuka siri na ya riọrọ ya ka ya laghachi Naijiria n’ihi na ohutubeghi nwa nwanne di
ya bu Emeka. Madam ya kwetara ma si na ọ bụ ego ugwọ onwa ya ka ya ga-eji
eme nkea.
Njem nlaghachi ya n’ala Naijiria site n’ọzara adịghịcha ọjọọ dịka oge ọ batara.
Azuka batara Naijiria na July 4, 2017, ebe nne na nna ya, tinyekwara ụmụaka ya
nabatara ya. Mana ọ maghị ma di ya ọ di ndu ma ọ nwụọla.
Nwa ya ọ na- enye ara tụpụ ọ pụọ enweghi ike ikọta onye ọ bụ, sọsọ Ada ya kọtara ya. N’amaghi ebe ọ dị ya nọ, ọ nọteghi aka n’ụlọ nne na nna ya, bi na Suleja dị na steeti Niger nke ala Naijiria.
“Site na ihere a n’ikpa oke ndị mmadụ, a garam binyere otu enyi m nwanyi bii na
Durumi dị n’Abuja ebe m malite ndụ ọhụụ”
Azụka n’eke isi ma n’ere ngwa di iche iche eji eme isi, tinyekwara ebe ọ n’arụ ọrụ
dika oje ozi n’otu ụlọ oriri na nkwari n’Abuja.
……akụkọ gaa aga n’iru n’agba nke abụọ.
Leave a Reply