Take a fresh look at your lifestyle.

Ụbọchị ochichi onye kwuo uche ya: Anyị agaghị echefu àjà ndị dike anyị chụrụ – President Buhari.

0 683


Ka Naijiria na-eme ncheta ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya nke iri abụọ na atọ, onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ụmụ amaala obodo ahụ agaghị echefu ihe ndị dike obodo ahụ chụrụ.

O nyere ndụmọdụ a na mgbasa ozi obodo niile nye ndị Naijiria maka ncheta ụbọchị pụrụ iche.

Onye ndu Naijiria kwụụrụ Moshood Abiola, onye a na-akwanyere ùgwù na ntuliaka onyeisiala n’afọ 1993, ma kwukwa na Naijiria ga-ewere ụbọchị June 12 ka ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya, iji kwanyere onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ nwụrụ anwụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *