Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Buhari arịọla ndị APC ka ha nọrọ n’otu.

0 512

Onye isi ala Muhammadu Buhari agwala ndị otu All Progressives Congress (APC) ka ha nọgide na-adị n’otu ma zere esemokwu.Na mkpọkọta ndị nnọchiteanya na mgbakọ pụrụ iche iji tụlee ịtụ vootu onye na-azọ ọkwa onyeisiala na ohere kachasị mma iji nweta mmeri na ntuli aka 2023.

N’okwu ya n’ụtụtụ Wenezde na Eagle Square, ebe mgbakọ ahụ pụrụ iche, Onyeisi ahụ kwuru na ọrụ dị oke mkpa dị n’ihu Abdullahi Adamu.

Onye isi ala ahụ gwara ndị nnọchiteanya ahụ okwu tupu mmemme ịtụ vootu maka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala ebido. Ọ gwara ndị ọrụ pati na ndị nnọchite anya ka ha gbasoo usoro kwesịrị ekwesị ma rube isi n’iwu na ụkpụrụ niile gbasara nhọpụta onye bu ọkọlọtọ pati.

Onye ndu Naijiria kwuru na onye na-ebu ọkọlọtọ aghaghị ịbụ onye maara ihe, onye nwere ezi uche ma nwee nkwenye siri ike na ịdị n’otu nke obodo na ike nke àgwà na nzube iji mee ka obodo ahụ gaa n’ihu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *