Adewole Adebayo apụtala dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala nke Social Democratic Party, SDP, na Naijiria.
Emere ntuli aka onye isi ala SDP na International Conference Centre na Abuja, isi obodo Naijiria.
Mazị Adebayo nwetara votu 1526 ebe nwanyị na-azọ ọchịchị bụ Khadijah Akunnu Lamidi nwere vootu 83.
Onye isi oche kọmitii na-ahụ maka ntuliaka bụ Dr Umar Ardo kwuputara Adewole Adebayo dịka onye meriri na onye SDP na-azọ ọkwa onyeisiala.
Ngụkọta ndị nnọchiteanya 1653 tụrụ vootu na ntuli aka mbụ nke pati.
N’okwu nnabata ya, onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke SDP kpọkuru ndị otu paati ka ha gbakọọ aka maka ọdịmma Naijiria.
Leave a Reply