King Felipe na Queen Letizia nke mba Spain ezigarala Prezidenti Muhammadu Buhari ozi nkasi obi maka odachi mere n’Port Harcourt isi obodo Steeti Rivers.
Na ozi nye Prezidenti Buhari bu nke onyeze His Majesty the King, Felipe VI,dere:
‘‘Mazi Prezidenti:
‘‘Maka odachia mere na obodo Port Harcourt, bu nke tara isi otutu mmadu,mu na goomenti nakwa ndi mba Spain na akasi gi obi maka nkea.
‘‘Onye Queen sokazi ezi ozia,site n’aka gi ka anyi na akasi ezinulo obula nkea meturu obi mana ekpe ekpere maka ndi meruru ahu igbake ngwa ngwa.’’
Opekata mpe mmadu iri ati na otu nwuru na odachiea bu mgbe ndi uka na eme emume crusade.
Leave a Reply