Onye odeakwụkwọ ukwu UN kwughachiri nkwa maka ọdịmma ndị ihe metụtara.
Onye odeakwụkwọ ukwu nke United Nations, Mr Antonio Guterres ekwughachila nkwa UN iji hụ maka ọdịmma ndị Boko Haram metụtara na ndị ha chụpụrụ n’ime obodo na North-East nke Nigeria ka bụ ihe kacha mkpa.
Onye odeakwụkwọ ukwu nke United Nations, Antonio Guterres kwuru nke a mgbe ọ rutere na Maiduguri, isi obodo Borno steeti, North East nke Nigeria.
Maazị Guterres kelere Gọvanọ Borno steeti maka ọrụ ọ rụrụ nke ọma.
“Achọrọ m ikele Gọvanọ maka ihe m hụrụ taa na ịgwa ya na m chọrọ ịrịọsi ike na mba ụwa ka ha ghọta Borno dị ka ọnọdụ olileanya, ịkwado ọrụ enyemaka mmadụ na Borno na ịghọta nnukwu ihe ịma aka nke na-eche Borno n’ihu na mgbanwe ihu igwe, inye nkwado maka ọrụ gọọmenti Borno na nke ọha mmadụ na Borno iji mepụta ọnọdụ maka ezigbo mmepe. ; iji mepụta ọnọdụ ụlọ akwụkwọ na-arụ ọrụ, ụlọ ọgwụ na-arụ ọrụ, ọrụ dị. Ebe ndị mmadụ ga-ebi n’udo, ndị mmadụ na-ebikwa n’ịdị n’otu”
Leave a Reply