Russia chọrọ ihe dị agba abụọ. Agba nke mbụ gụnyere
- Na Ukraine agaghị enwe mmekọ jikọrọ ha na mba ndị ọzọ (ha ga-akwụrụ onwe ha), ma jirikwa ọnụ ha kwuputa na ha enweghizi mmasị isonye otu Nato. Onyeisiala Volodymyr Zelensky nke Ukraine ekwerela maka nke a
- Ukraine ga-agabiga usoro nnapụ ngwaagha ga-ahụ na ha agaghị abụ nsogbu nye Russia
- A ga-ahụ na e chekwara asụsụ Russian na mba Ukraine, ka ọ hapụ isi na mba ahụ laa
- O kwukwara maka ihe ọ kpọọ “de-Nazification” (ịkwụsị ihe ọbụla yiri nke ndị Nazi), nke wutere Onyeisiala Zelensky si n’agbụrụ ndị Juu, nke ndị ezinaụlọ ya nwụrụ na mgbukpọ nke ‘Holocaust’, mana Turkey kwenyere na ọ gaghị ara Zelensky ahụ ikweta.
Agba nke abụọ gụnyere:
Putin chọrọ ka ya na Zelensky zute n’ihu na ihu mee nzukọ ikpe udo tupu ha ekpebie ndị nke a, Zelensky ekwetekwala ime nke a.
Ihe ndị Putin chọrọ n’agba nke a metụtara ihe gbasara Donbas dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Ukraqine, nke ụfọdụ n’ime ha kewapụrụla na Ukraine ma na-ekwu na ha bụ ndị Russia, nakwa ihe gbasara ebe Crimea kwụ.Article share tools
Share this post
- Copy this link
Leave a Reply